Mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ekerechi nwere nke ezie na nke ọjọọ dị ka mmadụ si chọọ. E nwere ọtụtụ mkpa ihe ekere ọmụmaatụ osisi na-egboro mmadụ mana ọ bụ mmadụ ka ọ dị n’aka ịhụ na osisi ndị a anwụsịsịghị site n’agwa ha na-akpaso ihe ekere a Chukwu kere iji nyere mmadụ aka n’ụwa. Chukwu kere oge niile dị ka udummiri nke bụ oge mmiri ozuzo. Ọ bụ mmiri ozuzo na-enye mmiri mmadụ na anụmanụ ji adị ndụ. Na mmadụ na anụmanụ nwere ikuku ha na-eku n’ume bụ site n’osisi, osisi na onwe ya ga-adịkwa ndụ site n’ume mmadụ kupuru. Ya mere o ji kee ukwu osisi na ihe ekere ndị ọzọ iji hụ na mmadụ ataghị ahụhụ mana oge ụfọdụ, mmadụ na ihe ekere ndị ọzọ anaghị ezipụta ezi mmekọrịta n’etiti onwe ha . Edemede a lebara anya ka odee abụ Igbo ndị a họọrọ si zipụta mmekọrịta dị n’etiti ekerechi na mmadụ. A ga-eji atụtụ ekerechi nke William Ruckert tụpụtara n’afọ 1978 bụ nke na-akọwa maka mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ihe ndị dị na gburugburu ya. Atụtụ a tụrụ anya na mmadụ kwesịrị ịhụ mkpa ọ dị ichekwa ekerechi dị na gburugburu ha. Abụ ndị a ga-eleba anya bụ “nkwụ” na “udummiri” iji chọpụta udi mmekọrịta dị n’etiti ihe erere abụọ ndị a.
